Native Bible

Psalms 29:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ* na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”

Psalms 29:9 in English

Psalms 29:9 · Berean Standard Bible

The voice of the LORD twists the oaks * and strips the forests bare. And in His temple all cry, “Glory!”

Context

7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ* na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 11Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya. 29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13 29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 29:9 Ime na-eme nne ele

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.