Native Bible

Psalms 29:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn* wulie elu dịka nwa atụ.

Psalms 29:6 in English

Psalms 29:6 · Berean Standard Bible

He makes Lebanon skip like a calf, and Sirion * like a young wild ox.

Context

4Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn* wulie elu dịka nwa atụ. 7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.