Abụ Ọma 29:3
Psalms 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe* nʼelu oke osimiri.
Psalms 29:3 in English
Psalms 29:3 · Berean Standard Bible
The voice of the LORD is over the waters; the God of glory thunders; the LORD is heard over many waters.
Context
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe* nʼelu oke osimiri. 4Olu Onyenwe anyị dị ike,
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.