Native Bible

Psalms 29:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.

Psalms 29:2 in English

Psalms 29:2 · Berean Standard Bible

Ascribe to the LORD the glory due His name; worship the LORD in the splendor of His holiness.*

Context

1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe* nʼelu oke osimiri. 4Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.