Proverbs 11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ihe ọtụtụ aghụghọ* bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị
ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,
ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;
ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;
ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,
ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;
ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,
ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,
ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.
Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,
otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,
ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;
ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị. 13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo. 14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri. 15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.* 16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,
ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta. 17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,
ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu. 18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,
ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi. 19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;
ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ. 20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị
ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya. 21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. 22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi. 23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,
ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ. 24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,
ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye. 25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;
onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa. 26Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,
ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke. 27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,
ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya. 28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,
ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ. 29Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,
onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe. 30Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,
onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe. 31Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;
a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
11:1 Lev 19:35-36; Dit 25:13-16; Mai 6:11
11:15 Maọbụ, ga-enwe udo
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.