Ilu 11:13
Proverbs 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
Proverbs 11:13 in English
Proverbs 11:13 · Berean Standard Bible
A gossip reveals a secret, but a trustworthy person keeps a confidence.
Context
11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,
ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;
ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị. 13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo. 14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri. 15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.