Ilu 11:15
Proverbs 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.*
Proverbs 11:15 in English
Proverbs 11:15 · Berean Standard Bible
He who puts up security for a stranger will surely suffer, but the one who hates indebtedness is secure.
Context
13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo. 14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri. 15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.* 16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,
ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta. 17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,
ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.