Ilu 11:16
Proverbs 11:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
Proverbs 11:16 in English
Proverbs 11:16 · Berean Standard Bible
A gracious woman attains honor, but ruthless men gain only wealth.
Context
14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri. 15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.* 16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,
ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta. 17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,
ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu. 18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,
ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.