Ilu 11:26
Proverbs 11:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
Proverbs 11:26 in English
Proverbs 11:26 · Berean Standard Bible
The people will curse the hoarder of grain, but blessing will crown the one who sells it.
Context
24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,
ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye. 25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;
onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa. 26Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,
ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke. 27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,
ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya. 28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,
ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.