Ilu 11:20
Proverbs 11:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
Proverbs 11:20 in English
Proverbs 11:20 · Berean Standard Bible
The perverse in heart are an abomination to the LORD, but the blameless in their walk are His delight.
Context
18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,
ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi. 19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;
ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ. 20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị
ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya. 21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. 22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.