Ilu 11:21
Proverbs 11:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
Proverbs 11:21 in English
Proverbs 11:21 · Berean Standard Bible
Be assured that the wicked will not go unpunished, but the offspring of the righteous will escape.
Context
19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;
ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ. 20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị
ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya. 21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. 22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi. 23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,
ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.