Ilu 11:23
Proverbs 11:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
Proverbs 11:23 in English
Proverbs 11:23 · Berean Standard Bible
The desire of the righteous leads only to good, but the hope of the wicked brings wrath.
Context
21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. 22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi. 23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,
ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ. 24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,
ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye. 25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;
onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.