Proverbs 10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ilu dị iche iche nke Solomọn:
Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;
ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ. 2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ. 3Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,
ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma. 4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,
ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba. 5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,
ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere. 6Onye ezi omume na-anata ngọzị,
ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 7Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,
ma aha onye ajọ omume ga-ere ure. 8Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,
ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi. 9Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,
ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta. 10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,
onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi. 11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,
ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,
ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile. 13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,
ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,
ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku. 15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye. 16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,
ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ. 17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,
ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo. 18Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị
na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu. 19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị
ma ndị nwere uche na-ejide ire ha. 20Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,
ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta. 21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,
ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. 22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
ọ naghị atụkwasị ya nsogbu. 23Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;
ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta. 24Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,
ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya. 25Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;
ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi. 26Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;
ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze. 27Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,
ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ. 28Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;
olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu. 29Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,
maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe. 30A pụghị iwezuga* onye ezi omume,
ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide. 31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,
ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,
ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
10:30 Maọbụ, ihopu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.