Ilu 10:15
Proverbs 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
Proverbs 10:15 in English
Proverbs 10:15 · Berean Standard Bible
The wealth of the rich man is his fortified city, but poverty is the ruin of the poor.
Context
13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,
ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,
ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku. 15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye. 16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,
ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ. 17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,
ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.