Ilu 10:4
Proverbs 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
Proverbs 10:4 in English
Proverbs 10:4 · Berean Standard Bible
Idle hands make one poor, but diligent hands bring wealth.
Context
2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ. 3Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,
ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma. 4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,
ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba. 5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,
ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere. 6Onye ezi omume na-anata ngọzị,
ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.