Native Bible

Proverbs 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.

Proverbs 10:12 in English

Proverbs 10:12 · Berean Standard Bible

Hatred stirs up dissension, but love covers all transgressions.*

Context

10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi. 11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile. 13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.