Ilu 10:23
Proverbs 10:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
Proverbs 10:23 in English
Proverbs 10:23 · Berean Standard Bible
The fool delights in shameful conduct, but a man of understanding has wisdom.
Context
21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,
ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. 22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
ọ naghị atụkwasị ya nsogbu. 23Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;
ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta. 24Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,
ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya. 25Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;
ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.