Ilu 11:6
Proverbs 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
Proverbs 11:6 in English
Proverbs 11:6 · Berean Standard Bible
The righteousness of the upright delivers them, but the faithless are trapped by their own desires.
Context
4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;
ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,
ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;
ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,
ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,
ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.