Aịzaya 9
Isaiah 9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan. 2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị
ahụla ìhè dị ukwuu;
ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ
ka ìhè nwukwasịrị. 3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,
mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,
ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,
dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,
dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ
mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.* 4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,
i gbajisiela
ibu arọ niile e bokwasịrị ha,
ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,
nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,
na uwe agha nke ọbara mechuru,
ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,
ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,
e nyekwala anyị otu nwa nwoke.
Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.
Ndị a ga-abụ aha ya,
Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,
Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze* ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo
nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,
chịakwa nʼalaeze ya.
Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezukwa nke a. 8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb
ọ ga-adakwasịkwa Izrel. 9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,
Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa
bụ ndị na-eji nganga
na mpako na-ekwu sị, 10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala
ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;
ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,
ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.” 11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin* ka ha bilie megide ha,
ọ kwaliekwala ndị iro ha. 12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ
ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,
ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. 14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,
ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,
ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;
ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,
ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,
nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,
ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:
ọ na-erepịa ogwu na uke,
ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,
mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,
ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;
ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;
ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,
onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.
Ha ga-eri
ma afọ agaghị eju ha;
nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.
Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.
Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
9:3 Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21
9:7 Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria.
9:11 Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.