Aịzaya 9:21
Isaiah 9:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 9:3 Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21 9:7 Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria. 9:11 Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.
Isaiah 9:21 in English
Isaiah 9:21 · Berean Standard Bible
Manasseh devours Ephraim, and Ephraim Manasseh; together they turn against Judah. Despite all this, His anger is not turned away; His hand is still upraised.
Context
19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,
ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;
ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;
ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,
onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.
Ha ga-eri
ma afọ agaghị eju ha;
nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.
Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.
Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
9:3 Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21
9:7 Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria.
9:11 Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.