Aịzaya 9:20
Isaiah 9:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
Isaiah 9:20 in English
Isaiah 9:20 · Berean Standard Bible
They carve out what is on the right, but they are still hungry; they eat what is on the left, but they are still not satisfied. Each one devours the flesh of his own offspring.*
Context
18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:
ọ na-erepịa ogwu na uke,
ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,
mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,
ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;
ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;
ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,
onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.
Ha ga-eri
ma afọ agaghị eju ha;
nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.
Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.
Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
9:3 Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21
9:7 Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria.
9:11 Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.