Native Bible

Isaiah 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.

Isaiah 9:18 in English

Isaiah 9:18 · Berean Standard Bible

For wickedness burns like a fire that consumes the thorns and briers and kindles the forest thickets which roll upward in billows of smoke.

Context

16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.