Aịzaya 9:18
Isaiah 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
Isaiah 9:18 in English
Isaiah 9:18 · Berean Standard Bible
For wickedness burns like a fire that consumes the thorns and briers and kindles the forest thickets which roll upward in billows of smoke.
Context
16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;
ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,
ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,
nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,
ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:
ọ na-erepịa ogwu na uke,
ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,
mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,
ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;
ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;
ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,
onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.
Ha ga-eri
ma afọ agaghị eju ha;
nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.