Aịzaya 9:17
Isaiah 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Isaiah 9:17 in English
Isaiah 9:17 · Berean Standard Bible
Therefore the Lord takes no pleasure in their young men; He has no compassion on their fatherless and widows. For every one of them is godless and wicked, and every mouth speaks folly. Despite all this, His anger is not turned away; His hand is still upraised.
Context
15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,
ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;
ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,
ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,
nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,
ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:
ọ na-erepịa ogwu na uke,
ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,
mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,
ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;
ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;
ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.