Aịzaya 9:16
Isaiah 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
Isaiah 9:16 in English
Isaiah 9:16 · Berean Standard Bible
For those who guide this people mislead them, and those they mislead are swallowed up.
Context
14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,
ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,
ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;
ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,
ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,
nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,
ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:
ọ na-erepịa ogwu na uke,
ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,
mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.