Aịzaya 9:14
Isaiah 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
Isaiah 9:14 in English
Isaiah 9:14 · Berean Standard Bible
So the LORD will cut off Israel’s head and tail, both palm branch and reed in a single day.
Context
12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ
ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,
ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. 14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,
ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,
ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;
ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.