Aịzaya 9:13
Isaiah 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
Isaiah 9:13 in English
Isaiah 9:13 · Berean Standard Bible
But the people did not return to Him who struck them; they did not seek the LORD of Hosts.
Context
11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin* ka ha bilie megide ha,
ọ kwaliekwala ndị iro ha. 12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ
ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,
ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. 14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,
ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,
ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.