Native Bible

Isaiah 9:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.

Isaiah 9:19 in English

Isaiah 9:19 · Berean Standard Bible

By the wrath of the LORD of Hosts the land is scorched, and the people are fuel for the fire. No man even spares his brother.

Context

17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 9:3 Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21 9:7 Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria. 9:11 Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.