Aịzaya 9:8
Isaiah 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.
Isaiah 9:8 in English
Isaiah 9:8 · Berean Standard Bible
The Lord has sent a message against Jacob, and it has fallen upon Israel.
Context
6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,
e nyekwala anyị otu nwa nwoke.
Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.
Ndị a ga-abụ aha ya,
Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,
Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze* ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo
nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,
chịakwa nʼalaeze ya.
Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezukwa nke a. 8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb
ọ ga-adakwasịkwa Izrel. 9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,
Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa
bụ ndị na-eji nganga
na mpako na-ekwu sị, 10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala
ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;
ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,
ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.