Native Bible

Isaiah 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”

Isaiah 9:10 in English

Isaiah 9:10 · Berean Standard Bible

“The bricks have fallen, but we will rebuild with finished stone; the sycamores have been felled, but we will replace them with cedars.”

Context

8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel. 9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị, 10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.” 11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin* ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha. 12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.