Aịzaya 9:5
Isaiah 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
Isaiah 9:5 in English
Isaiah 9:5 · Berean Standard Bible
For every trampling boot of battle and every garment rolled in blood will be burned as fuel for the fire.
Context
3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,
mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,
ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,
dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,
dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ
mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.* 4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,
i gbajisiela
ibu arọ niile e bokwasịrị ha,
ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,
nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,
na uwe agha nke ọbara mechuru,
ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,
ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,
e nyekwala anyị otu nwa nwoke.
Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.
Ndị a ga-abụ aha ya,
Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,
Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze* ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo
nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,
chịakwa nʼalaeze ya.
Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezukwa nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.