Native Bible

Isaiah 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.

Isaiah 9:4 in English

Isaiah 9:4 · Berean Standard Bible

For as in the day of Midian You have shattered the yoke of their burden, the bar across their shoulders, and the rod of their oppressor.

Context

2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị. 3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.* 4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.