Aịzaya 23
Isaiah 23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nke a bụ amụma megide Taịa:
Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish
nʼihi na e bibiela Taịa,
ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.
Ozi erutela ha aka
site nʼobodo Saiprọs. 2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.
Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,
ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa. 3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,
ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,
owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,
ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche. 4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,
nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;
“Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;
o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.” 5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,
ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa. 6Gabiganụ ruo Tashish
tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu. 7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?
Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?
Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ
ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ? 8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,
bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,
mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,
nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa? 9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,
nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,
na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị. 10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,
unu ụmụada Tashish,
nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri
mee ka alaeze ha niile maa jijiji.
O nyela iwu banyere Fonisia*
ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,
gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.
“Bilie, gafee garuo Saiprọs,
ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa,
ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!
Ndị Asịrịa mere ya
ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.
Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu
tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,
mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,
nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike. 15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,
gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;
kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,
ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.” 17E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. 18Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.
23:11 Ya bụ, Kenan
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.