Native Bible

Isaiah 23:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”

Isaiah 23:4 in English

Isaiah 23:4 · Berean Standard Bible

Be ashamed, O Sidon, the stronghold of the sea, for the sea has spoken: “I have not been in labor or given birth. I have not raised young men or brought up young women.”

Context

2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa. 3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche. 4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.” 5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa. 6Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.