Aịzaya 23:6
Isaiah 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
Isaiah 23:6 in English
Isaiah 23:6 · Berean Standard Bible
Cross over to Tarshish; wail, O inhabitants of the coastland!
Context
4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,
nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;
“Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;
o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.” 5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,
ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa. 6Gabiganụ ruo Tashish
tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu. 7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?
Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?
Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ
ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ? 8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,
bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,
mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,
nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.