Aịzaya 23:7
Isaiah 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
Isaiah 23:7 in English
Isaiah 23:7 · Berean Standard Bible
Is this your jubilant city, whose origin is from antiquity, whose feet have taken her to settle far away?
Context
5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,
ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa. 6Gabiganụ ruo Tashish
tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu. 7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?
Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?
Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ
ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ? 8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,
bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,
mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,
nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa? 9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,
nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,
na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.