Aịzaya 23:9
Isaiah 23:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
Isaiah 23:9 in English
Isaiah 23:9 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts planned it, to defile all its glorious beauty, to disgrace all the renowned of the earth.
Context
7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?
Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?
Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ
ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ? 8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,
bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,
mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,
nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa? 9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,
nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,
na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị. 10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,
unu ụmụada Tashish,
nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri
mee ka alaeze ha niile maa jijiji.
O nyela iwu banyere Fonisia*
ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.