Aịzaya 23:11
Isaiah 23:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia* ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
Isaiah 23:11 in English
Isaiah 23:11 · Berean Standard Bible
The LORD has stretched out His hand over the sea; He has made kingdoms tremble. He has given a command that the strongholds of Canaan be destroyed.
Context
9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,
nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,
na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị. 10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,
unu ụmụada Tashish,
nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri
mee ka alaeze ha niile maa jijiji.
O nyela iwu banyere Fonisia*
ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,
gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.
“Bilie, gafee garuo Saiprọs,
ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa,
ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!
Ndị Asịrịa mere ya
ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.
Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu
tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,
mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.