Native Bible

Isaiah 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”

Isaiah 23:12 in English

Isaiah 23:12 · Berean Standard Bible

He said, “You shall rejoice no more, O oppressed Virgin Daughter of Sidon. Get up and cross over to Cyprus— even there you will find no rest.”

Context

10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia* ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.