Aịzaya 23:12
Isaiah 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
Isaiah 23:12 in English
Isaiah 23:12 · Berean Standard Bible
He said, “You shall rejoice no more, O oppressed Virgin Daughter of Sidon. Get up and cross over to Cyprus— even there you will find no rest.”
Context
10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,
unu ụmụada Tashish,
nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri
mee ka alaeze ha niile maa jijiji.
O nyela iwu banyere Fonisia*
ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,
gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.
“Bilie, gafee garuo Saiprọs,
ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa,
ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!
Ndị Asịrịa mere ya
ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.
Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu
tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,
mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,
nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.