Aịzaya 23:10
Isaiah 23:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
Isaiah 23:10 in English
Isaiah 23:10 · Berean Standard Bible
Cultivate * your land like the Nile, O Daughter of Tarshish; there is no longer a harbor.
Context
8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,
bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,
mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,
nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa? 9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,
nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,
na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị. 10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,
unu ụmụada Tashish,
nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri. 11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri
mee ka alaeze ha niile maa jijiji.
O nyela iwu banyere Fonisia*
ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike. 12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,
gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.
“Bilie, gafee garuo Saiprọs,
ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.