Native Bible

Isaiah 23:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.

Isaiah 23:14 in English

Isaiah 23:14 · Berean Standard Bible

Wail, O ships of Tarshish, for your harbor has been destroyed!

Context

12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike. 15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.