Aịzaya 23:14
Isaiah 23:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.
Isaiah 23:14 in English
Isaiah 23:14 · Berean Standard Bible
Wail, O ships of Tarshish, for your harbor has been destroyed!
Context
12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,
gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.
“Bilie, gafee garuo Saiprọs,
ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.” 13Lee anya nʼala ndị Kaldịa,
ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!
Ndị Asịrịa mere ya
ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.
Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu
tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,
mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe. 14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,
nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike. 15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,
gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;
kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,
ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.