Aịzaya 23:16
Isaiah 23:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”
Isaiah 23:16 in English
Isaiah 23:16 · Berean Standard Bible
“Take up your harp, stroll through the city, O forgotten harlot. Make sweet melody, sing many a song, so you will be remembered.”
Context
14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,
nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike. 15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,
gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;
kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,
ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.” 17E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. 18Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.
23:11 Ya bụ, Kenan
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.