Aịzaya 23:17
Isaiah 23:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.
Isaiah 23:17 in English
Isaiah 23:17 · Berean Standard Bible
And at the end of seventy years, the LORD will restore Tyre. Then she will return to hire as a prostitute and sell herself to all the kingdoms on the face of the earth.
Context
15A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a: 16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,
gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;
kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,
ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.” 17E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. 18Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.
23:11 Ya bụ, Kenan
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.