Aịzaya 23:2
Isaiah 23:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.
Isaiah 23:2 in English
Isaiah 23:2 · Berean Standard Bible
Be silent, O dwellers of the coastland, you merchants of Sidon, whose traders have crossed the sea.*
Context
1Nke a bụ amụma megide Taịa:
Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish
nʼihi na e bibiela Taịa,
ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.
Ozi erutela ha aka
site nʼobodo Saiprọs. 2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.
Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,
ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa. 3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,
ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,
owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,
ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche. 4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,
nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;
“Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;
o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.