Aịzaya 23:1
Isaiah 23:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.
Isaiah 23:1 in English
Isaiah 23:1 · Berean Standard Bible
This is the burden against Tyre: Wail, O ships of Tarshish,* for Tyre is laid waste, without house or harbor. Word has reached them from the land of Cyprus.*
Context
1Nke a bụ amụma megide Taịa:
Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish
nʼihi na e bibiela Taịa,
ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.
Ozi erutela ha aka
site nʼobodo Saiprọs. 2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.
Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,
ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa. 3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,
ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,
owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,
ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.