Abụ nke Abụ 8
Song of Songs 8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;
nke otu nne mụrụ mụ na ya
m gaara esutu gị ọnụ
mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ
ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya. 2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,
ka ị nọdụ nʼebe ahụ,
nʼụlọ onye ziri m ihe.
Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,
mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta
tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,
onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;
nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;
nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
(6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu. 8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta
ma ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,
nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? 9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;
ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,
anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. 10Abụ m mgbidi,
ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.
Otu a ka m siri dị nʼanya ya
dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,
o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta
puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.* 12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.
Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,
ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. 13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,
gị na ndị enyi gị,
kwere ka m nụ olu gị. 14Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,
bịakwute m dịka mgbada,
maọbụ dịka nwa ele
na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
8:6 Ilu 6:34-35
8:11 Mat 21:33
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.