Native Bible

Song of Songs 8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ nke Abụ 8
1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya. 2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị. (6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu. 8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? 9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. 10Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.* 12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. 13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị. 14Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara. 8:6 Ilu 6:34-35 8:11 Mat 21:33

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.