Abụ nke Abụ 8:6
Song of Songs 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị. (6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu.
Song of Songs 8:6 in English
Song of Songs 8:6 · Berean Standard Bible
(5) I roused you under the apple tree; there your mother conceived you; there she travailed and brought you forth. (6) Set me as a seal over your heart, as a seal upon your arm. For love is as strong as death, its jealousy * as unrelenting as Sheol. Its sparks are fiery flames, the fiercest blaze of all.
Context
4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta
tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,
onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;
nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;
nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
(6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu. 8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta
ma ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,
nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.