Native Bible

Song of Songs 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.

Song of Songs 8:4 in English

Song of Songs 8:4 · Berean Standard Bible

O daughters of Jerusalem, I adjure you: Do not arouse or awaken love until the time is right.

Context

2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị. (6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.