Abụ nke Abụ 8:4
Song of Songs 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.
Song of Songs 8:4 in English
Song of Songs 8:4 · Berean Standard Bible
O daughters of Jerusalem, I adjure you: Do not arouse or awaken love until the time is right.
Context
2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,
ka ị nọdụ nʼebe ahụ,
nʼụlọ onye ziri m ihe.
Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,
mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta
tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,
onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;
nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;
nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
(6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.