Abụ nke Abụ 8:2
Song of Songs 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet.
Song of Songs 8:2 in English
Song of Songs 8:2 · Berean Standard Bible
I would lead you and bring you to the house of my mother who taught me. I would give you spiced wine to drink, the nectar of my pomegranates.
Context
1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;
nke otu nne mụrụ mụ na ya
m gaara esutu gị ọnụ
mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ
ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya. 2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,
ka ị nọdụ nʼebe ahụ,
nʼụlọ onye ziri m ihe.
Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,
mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta
tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.