Abụ nke Abụ 8:1
Song of Songs 8:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.
Song of Songs 8:1 in English
Song of Songs 8:1 · Berean Standard Bible
O that you were to me like a brother who nursed at my mother’s breasts! If I found you outdoors, I would kiss you, and no one would despise me.
Context
1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;
nke otu nne mụrụ mụ na ya
m gaara esutu gị ọnụ
mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ
ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya. 2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,
ka ị nọdụ nʼebe ahụ,
nʼụlọ onye ziri m ihe.
Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,
mmanya ụtọ nke pomegranet. 3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.