Native Bible

Song of Songs 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.

Song of Songs 8:5 in English

Song of Songs 8:5 · Berean Standard Bible

Who is this coming up from the wilderness, leaning on her beloved?

Context

3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị. (6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.