Abụ nke Abụ 8:5
Song of Songs 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.
Song of Songs 8:5 in English
Song of Songs 8:5 · Berean Standard Bible
Who is this coming up from the wilderness, leaning on her beloved?
Context
3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta
tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. 5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,
onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;
nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;
nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
(6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.